Akoko

Mahadum Adekunle Ajasin, Akungba Akoko

Akoko bụ nnukwu ọdịbendị Yoruba dị n'akụkụ ugwu ọwụwa anyanwụ nke ala Yoruba . [1] Mpaghara ahụ sitere na Ondo Steeti ruo Edo Steeti dị na ndịda ọdịda anyanwụ Naịjirịa. Akokos dị ka obere ìgwè mejupụtara pacenti iri abụo mara atọ nke ndị bi na Ondo Steeti, na pacenti ise mara asaa nke ndị bi n'Edo Steeti, N'ime Kansụl Gọọmentị Obodo iri na asatọ dị ugbu a, ọ mejupụtara anọ; Akoko ugwu ọwụwa anyanwụ, Akoko ugwu ndịda, Akoko ndịda ọwụwa anyanwụ na Akoko ndịda ọdịda ọwụwa anyanwụ, yana okpuru ọchịchị ime obodo Akoko Edo nke Edo Steeti. Mahadum Adekunle Ajasin, mahadum nke steeti a nwere ikike maka ihe dị ka ụmụ akwụkwọ agụmakwụkwọ dị elu puku iri abụo na ihe karịrị ngalaba iri ise na ngalaba asaa dị na Akungba-Akoko. [2][3] Ụlọ ọgwụ ọkachamara nke steeti a dị na Ikare Akoko, ebe ụlọ ọgwụ obodo dị na Oka-Akoko na Ipe-Akoko.

Arigidi, bụ asụsụ olundi, a na-asụ ya na okpúru ọchịchị ime obodo gasị nke Akoko ugwu ọwụwa anyanwụ, Akoko ugwu, Ekiti ọwụwa anyanwụ na Ijumu.   Akoko nwere ihe dị ka obere obodo na obodo nta dị iri anọ na ise, nke kachasị n'ebe nkume dị n'ebe ugwu Ondo steeti.[4] N'agbanyeghị nke ahụ, ala nkume ahụ nwere ike inyere mpaghara ahụ aka ịghọ ụdị ite na-agbaze na ọdịbendị dị iche iche na-abịa site n'ebe ugwu, ọwụwa anyanwụ na ndịda obodo Yoruba ma karịa. Akoko ghọrọ otu n'ime agbụrụ Yoruba ole na ole na-enweghị asụsụ obodo pụrụ iche.Obodo ndị isi Akoko gụnyere; Ọkà, Ikare, Oba, Ikun, Arigidi, Ugbe, Ogbagi, Okeagbe, Ikaram, Ibaram, Iyani, Akungba, Erusu, Ajowa, Akunu, Ged Mosu, Isua, Auga, Ikakumo, Supare, Epinmi, Ipe, Ifira, Ise, Iboropa, Irun, Iye, Afin, Igashi, Sosan, Ipesi, Etioro, Ayegunle, Eriti na Oyin. Na mgbakwunye dị otu a, e nwere ọtụtụ obodo ndị ọzọ na-achị onwe ha nke ogbè dịgasị iche iche.[5]

Ndị Akoko bi n'ókèala nke ala Yoruba ma ndị Owé Okun Yorubas na ndị Ebira na-ejikọta ha n'ebe ugwu, ndị Ekitis na-ejikwa ha n'akụkụ ọdịda anyanwụ, ndị Owos na Owan maọbu Ora na-ejikarị ha n'ụzọ ndịdana ndị Afemai na-ejide ha n'Ebe ọwụwa anyanwụ.

  • Ikare Akoko bụ obodo kachasị ukwuu n'ógbè Akoko nke nwere ihe dị ka mmadụ puku narị na iri ise, bi n'afọ 2008. [6] O nwere ụlọ ọrụ I.C.T ebe ndị ya nwere ohere ijikọ na ikwurịta okwu na ndị ọzọ gafee mba ahụ na gburugburu ụwa.
  • Oka Akoko bụ obodo nke abụọ kachasị ukwuu na Akokoland, nwere ndị bi na ya dị puku narị iri atọ na abụọ, narị asatọ . O nwere obodo ise dị iche iche nke Ayegunle-Oka, Oke-Oka. Ọ bụ ihe a ma ama maka Oke-Maria katoliki Grotto, ebe ndị njem nleta na-ewu ewu.
  • Oba Akoko bụ obodo ọzọ dị na Akoko okpuru ọchịchị ime obodo nke ndịda ọdịda ọwụwa anyanwụ. Oba bụ ọnụ ụzọ mbata nke Ala Akoko n'ihi na ọ bụ ebe obibi mbụ zutere n'ebe ugwu site na obodo Owo banye n'ime obodo Akoko.
  1. Pax Britannica, Security and Akoko Resettlement, 1897–1960 (3 October 2021). Archived from the original on 15 July 2024. Retrieved on 21 July 2024.
  2. About Adekunle Ajasin University (3 October 2021).
  3. Adekunle Ajasin University visitor web portal (3 October 2021). Archived from the original on 28 October 2022. Retrieved on 21 July 2024.
  4. Pre-colonial Elitism: A Study in Traditional Model of Governance in Akokoland (3 October 2021). Archived from the original on 2023-02-06. Retrieved on 2024-07-21.
  5. Religious interaction among the Akoko of Nigeria (3 October 2021).
  6. About Ikare, Nigeria (3 October 2021).

From Wikipedia, the free encyclopedia · View on Wikipedia

Developed by Nelliwinne