Datooga language

Datooga language
asụsụ, modern language
obere ụdị nkeSouthern Nilotic Dezie
mba/obodoTanzania Dezie
ụmụ amaala kaDodoma Region, Mara Region, Singida Region, Tabora Region, Manyara Region Dezie
Ọkwa asụsụ Ethnologue5 Na-etolite Dezie

Datooga (nke bu kwa Datog, Datoga, Taturu, Mang'ati, Tatoga ma ọ bụ Tatog) bụ asụsụ Nilotic ma ọ bụ ụyọkọ olumba nke Ndịda Nilotic. Ndị Datooga nke Nnukwu Mgbawa (Great Rift Valley) nke Tanzania na-asụ ya. A na-ejikwa aha Sukuma Taturu mee ihe mgbe ụfọdụ na Bekee; eweputara aha Swahili Mang'ati sitere na Maasai, ebe ọ pụtara "onye iro". Otú ọ dị, ọ dịghị ka ihe na-akpasu ndị Datooga iwe, ebe ọ bụ na ha nwere mpako n'ịbụ onye iro akụkọ ihe mere eme nke ndị Maasai, Mang'ati bu aha eji mara otu ahụ na Swahili. Na mgbakwunye, ọtụtụ aha agbụrụ na nke olumba ka enwere ike ịchọta maka ndị mmadụ ma ọ bụ asụsụ n'ozuzu.

A na-ekwu na ndị Datooga bụ otu n'ime ndị na-agughi akwụkwọ na Tanzania, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ nweghị agụmakwụkwọ n'asụsụ ahụ; a kọọrọ na agụmakwụkwọ na ala Swahili dị ntakịrị n'obodo ụfọdụ. Otú ọ dị, edere asụsụ Barabaiga na Gisamjanga, a na-arụkwa ọrụ na asụsụ nke Asimjeeg.


From Wikipedia, the free encyclopedia · View on Wikipedia

Developed by Nelliwinne