Epe bụ obodo na mpaghara gọmentị ime obodo (LGA) na Steeti Lagos, Naijiria nke dị n'akụkụ ugwu nke Lekki Lagoon na ihe dị ka kilomita 90 site na Ibadan.[1] N'oge ọnụ ọgụgụ mmadụ nke afọ 2006, ọnụ ọgụgụ ndị bi na Epe dị ihe dịka 181,409.[1]
Enweghị onye ọchịchị kachasị elu n'ógbè ahụ ebe ọ bụ na e nwere obodo abụọ nwere ndị eze n'otu n'otu. Ndị a bụ obodo Eko Epe na Ijebu Epe n'ime otu obodo ahụ.Ememme ndị a ma ama a na-emekarị n'ala Epe gụnyere Ememme Kayo-kayo, ụbọchị Ebi, Ojude-Oba, na ụbọchị Epe.[2]
Okporo ụzọ dị n'ọnụ ụzọ Epe site na Lekki-Epe Expressway nwere ihe a tụrụ atụ nke nnukwu azụ abụọ, nke Gọmentị Lagos Steeti guzobere.[3][4]
Ụlọ akwụkwọ dị elu a ma ama dị ka Lagos State University(LASU), Yaba College of Technology, Michael Otedola College of Primary Education(MOCOPED), Pan-Atlantic University(PAU) niile nwere ụlọ akwụkwọ na mpaghara Epe nke Lagos, Nigeria.[5][6][7]