Ivan Hrynokh

Ivan Hrynokh ( Ukrainian  ; 28 Disemba afọ 1907 – 14 Ọktoba afọ 1994) bụ onye Ukrainian onye ụkọchukwu Greek-Katọlik na onye na-akwado obodo ndi Ukraine.

A mụrụ ya n'obodo Lviv_Oblast" dị nso na obodo Lviv na Mykhailo yana Anastiya Hrynokh na 28 ọnwa Disemba afọ 1907, nne na nna ya kwagara obodo United States n'afọ 1909 wee biri na Philadelphia ebe a mụrụ nwanne ya nwoke bu Stepan n' afọ 1911. Ezinụlọ ahụ laghachiri n'obodo ha n'afọ 1911.

Ivan nwetara akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ sekọndrị n' obodo Lviv wee malite ọmụmụ ihe gbasara nkà mmụta okpukpe n'ebe ahụ, bụ nke ọ gụsịrị akwụkwọ na doctorate na Innsbruck, Munich na Paris . Ọ nakwere nkwa ndị ụkọchukwu n' ọnwa Septemba afọ 1932 site na Metropolitan Andrei Sheptytsky ma kụziere nkà ihe ọmụma na nkà mmụta okpukpe na Theological Academy na Lviv. Ndị ọchịchị Poland nwụchiri ya n' afọ 1938 ma nọrọ n'ụlọ mkpọrọ n'ogige a kpọchiri Bereza Kartuska ruo mgbe Poland dara.

Mgbe ndị Soviet weghaara Western Ukraine, Hrynokh gara Kraków ebe o kwusara ozi ọma ma na-arụsi ọrụ ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke obodo Ukraine. Ọ ghọrọ ụkọchukwu nke Nachtigall Battalion . Mgbe mgbasa nke Battalion gasịrị, o sonye n' ogbako nke ato maka ndị ama dịka Great Conference of the Organisation of Ukrainian Nationalists, nke mere na Ukraine n' afọ 1943 ma bụrụ otu n'ime ndị na-akpali akpali nke Ukrainian Supreme Liberation Council, ebe a họpụtara ya onye isi oche n' ọnwa Juli afọ 1944.

N'ọnọdụ a, o mezuru ọrụ nke diplomatic na mkparịta ụka ya na gọọmentị Romania na Hungary. E zigara ya na West ka ịchọta njikọ maka UPA na ndị agha niile wee si Prague gaa obodo Germany na-edozi na Munich . N'afọ 1950, ọ ghọrọ onye isi nke ngalaba mba ofesi nke UHVR nke ọ na-elekọta ruo afọ 1980. N'otu oge ahụ, ọ bụ onye isi nke ọha mmadụ maka agụmakwụkwọ mba ofesi na tọrọ ntọala akwụkwọ akụkọ "Suchasna Ukraina" (Contemporary Ukraine), "Ukrainska Literaturna hazeta" (Ukrainian akwụkwọ akụkọ) na magazin "Suchasnist" (Taa).

Ọ gara n'ihu na-akụzi nkà mmụta okpukpe na nkà ihe ọmụma na seminarị dị na Hischberg na Kulenburg ma bụrụ onye prọfesọ na Ukrainian Free University na Munich.

Na ntọhapụ nke ndị Soviet nke Obodo ukwu Joseph Slipyj n' afọ 1963, e guzobere Mahadum Katọlik nke Ukraine na Rome, ebe ọ ghọrọ prọfesọ. Ọ bụ otu n’ime ndị malitere òtù ndị bishọp maka Ụka Ukrainian-Katọlik.

Hrynokh nwụrụ na ụbọchị 14 ọnwa Ọktoba afọ 1994 na Munich, mgbe ọ dị afọ 87. E liri ya na Pennsylvania.


From Wikipedia, the free encyclopedia · View on Wikipedia

Developed by Nelliwinne