Ogene bụ ngwa egwu ndi Igbo. Ọ bụkwazi aha egwu. Ihe eji akpụ ogene bụ igwe. [1] Ndi na-eme Ogene bu ndị Ọkpụ ụzụ. Nke a mere e ji asị ụzụ na-amaghị akpụ ogene lee egbe anya n' odu. (Ogene nwere ihu abuo ka odudu egbe).
ọbụkwa ndi Igbo bi na Naijeria na- arụpụta ma na-agbakwa egwu ogene.
Mgbịrịgba Ogene ka ndị Omambala River basin dị n'ala Igbo ji mere isi ngwa egwu. Ọ bụ ngwa egwu na-egosi nke a kpọrọ Struck idiophone class, Ọkpụ ụzụ jikwa igwe pụrụ iche kpụọ ya. Ụdịdị ya dị basabasa bịa nwee okokoro n'ime ya. Ụda ya na-esi mkpọtụ ịma jijiji mgbe akụrụ ya. na-eji osisi nkụ were akụ ya.