Ogoja bụ ọchịchị ime obodo dị na kurọsụ Riva Steeti, Nigeria . [1] Isi ụlọ ọrụ ya bụ obodo Ogoja dị n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke dị nso na okporo ụzọ awara awara A4 na . [2]
Ọ nwere mpaghara 972 km² ya na ọnụ ọgụgụ mmadụ ruru otu puku narị iri asaa na otu, narị iteghete na otu na ngụkọ nke afọ 2006. [3]
Katidral St. Benedict ya bụ ụlọ nsọ nke Dayọsis Roman Katọlik nke Ogoja . [4]
Koodu nzipu ozi nke mpaghara ahụ bụ narị ise na iri ise. [5]
Obodo ahụ bụ otu n'ime ógbè ndị ahụ tupu oge ọchịchị. [6] Ọ nwere ọtụtụ mpaghara agbụrụ, gụnyere Ishibori (obodo a nwere agbụrụ dị iche iche dịka Uhmuria, Ikaptang, Ikajor, Ishinyema, Ikariku, Imerakorm) na Igoli dị ka obodo etiti. Mbube, ịbụ otu n'ime ebo ndị bụ isi, nwere obodo dị iche iche, gụnyere: Odajie, Adagum, Ekumtak, Idum, Ojerim, Egbe, Ogberia Ogang na Ogberia Ochoro, Oboso, Benkpe, Edide, Bansan, Aragban, Nkim na ndị ọzọ. Isi iyi ndụ ha bụ nri ugbo, ọkachasị ịkọ ugbo akpu, ji, mmanụ nkwụ, ite mmanya nkwú n' ihe ndị ọzọ [7] Ekajuk, bụ otu n'ime ndị isi agbụrụ dị n' okpuru ọchịchị Ogoja. E kewara ya ngalaba nke mbụ na ngalaba nke abụọ ma gụnye nnukwu obodo dịka Nwang, Ekpogrinya, Esham, Egbong, Nnang, Ewinimba na Bansara (ndị bụ mkpokọta obodo [8] )