ụdịekere | nwoke ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
aha enyere | Pete ![]() |
aha ezinụlọ ya | Edochie ![]() |
ụbọchị ọmụmụ ya | 7 Maachị 1947 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Enúgwu ![]() |
nwanne | Tony Edochie ![]() |
Dị/nwunye | Josephine Edochie ![]() |
nwa | Yul Edochie ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa ![]() |
ọrụ ọ na-arụ | omee, omee ihe nkiri, omee ![]() |
ụdị ọrụ ya | theater arts ![]() |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1967 ![]() |
okpukpere chi/echiche ụwa | Catholicism ![]() |
Ụcha ime anya | brown ![]() |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii ![]() |
ihe nkiri | Unroyal, Lionheart, Above Death: In God We Trust ![]() |
Ọrụ ama ama | Things fall apart ![]() |
Ihe nrite | Africa Magic Viewers' Choice Awards ![]() |
nnọchiaha nkeonwe | L485 ![]() |
Chief Pete Edochie, MON (amụrụ ya n' ụbọchị asaa n'ime ọnwa Machị n'afọ 1947) [1] [2] bụ nwa afọ Igbo onye Naịjirịa na-eme ihe nkiri. A na-ele Edochie anya dị ka otu n'ime ndị na - eme ihe nkiri mara mma nke Afrịka, na - asọpụrụ ebe enye goro ya Industry Merit Award nke Afrịka Magic na Lifetime Achievement site n'aka Afrịka Film Academy [3] Ọ bụ ezie na nwa amadi bụ onye nchịkwa na onye mgbasa ozi no oge gara aga, [4] Ọ ghọrọ onye a ma ama na 1980s mgbe Ọ rụrụ ọrụ dị ka Okonkwo na mmegharị akwụkwọ Chinua Achebe nke bụ akụkọ nkahasị mma oge niile akpọrọ Things Fall Apart . Edochie bụkwa onye Katọlik. [5] N'afọ 2003, Onye isi ala Olusegun Obasanjo kwanyeere ya ugwu dị ka onye otu Order of the Niger . [6] [7]
Ọ banyere ịgbasa ozi na igbe okwu redio na 1967 mgbe Ọ dị afọ iri abụọ [8] dị ka onye nọ na obere ọkwa na akụkụ akpọrọ programmers. Emesiri bulie ya elu n'ọkwa nke Onye isi ngalaba ahụ. Agbanyeghị na ọ bụ onye isi na ngalaba programmes, ọ na arụ ọrụ dị ka onye nnochite anya onye isi njikwa kachasị ma ọ bu onye osote ya. Ọ kwụsịrị ọrụ na ABS n'ihi na gọọmentị oge ahụ kpebiri iwebata ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ụlọ ọrụ FM, n'ihi nke a agwara ndị ọrụ njikwa niile ka ha pụọ, tinyere ya. Ọ bu Edochie kwesiri ịbụ onye ga-anọchi onye isi njikwa kachasị ozugbo mana ọ hapụ ọrụ ahụ ma sonye n'ụlọ ọrụ ihe nkiri. Tupu mgbe ahụ, O sonye na ngosipụta nke Things Fall Apart ma nwee mmeri na nturu ugo nke mba uwa niile. BBC gbara ukwu na Naịjirịa iji gbaa ya ajụjụ ọnụ maka ọrụ ya na Things Fall Apart .
N’ọnwa Septemba afọ 2017, Edochie kwadoro Wikimedia na Naịjirịa site na nsonye ime ihe nyonyo vidiyo iji mee ka amata maka uru dị na Wikipedia n’etiti ndị agadi. [9] [10]