ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
aha enyere | R. |
aha pseudonym | Crustified Dibbs, R.A. the Rugged Man |
ụbọchị ọmụmụ ya | 10 Jenụwarị 1974 |
Ebe ọmụmụ | Long Island |
ọrụ ọ na-arụ | rapper, onye na-emeputa ihe ndeko |
ebe agụmakwụkwọ | Ward Melville High School |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1992 |
ngwa egwu | olu egwụ |
diskografi | R.A. the Rugged Man discography |
ebe e guzobere | Long Island |
akara ndekọ | Jive Records |
webụsaịtị | http://www.ratheruggedman.com/ |
Templeeti:Infobox musical artist R.A Thorburn onye amụrụ na Jenụwarị 10, 1974,eji aha nkwago bụ R.A the Rugged Man mara ya. Ọ bụ onye Amerịka na- agụ egwu rap ma n'arụpụtakwa egwu. [1] Ọ malitere ọrụ egwu ya mgbe ọ dị afọ iri na abụọ,site n'iwuli nka ọ nwere n'egwu na mpaghara ụlọ. Thorburn bịanyere aka na aJive Records bụ egwu nke gbagotara mgbe ọ dị afọ iri na asatọ mana ewepụtaghị efere egwu ya nke mbụ bụ Night of the Bloody Apes . [2]
Kemgbe ahụ ọ rụrụ na nkwado nke Mobb Deep, Wu-Tang Clan, Kool G Rap, and Notorious B.I.G., gbakwunyere ndị mmepụta egwu dị ka Erick Sermon, Trackmasters, DJ Quik, The Alchemist, J-Zone, and Ayatollah. Ọ pụtara na albọm atọ niile kpụ ọkụ n'ọnụ nke Rawkus gbakwunyere nrepu otu ma ọ bụ abụọ nke albọm WWF Aggression .Ka otuCapitol Records weturu obere ezumike( nke ọ nwere ohere ya dekọ albọm n'ewepụtaghị bụ, American Lowlife), Thorburn bịanyere aka nkwekọrị́ta na labeelụ nọọrọ onwe ya bụ Nature Sounds ma wepụta ọrụ mbụ ya bụ, Die, Rugged Man, Die. Na 2013, Thorburn wepụtara albọm nke abụọ bụ, Legends Never Die, site n'aka ọrụ Nature Sounds.[3]
Na mgbakwunye na ọrụ hip họp ya, Thorburn nọ na-arụsi ọrụ ike dị ka onye na-ekwu okwu njikwa egwuregwu ịkụ ọkpọ na onye na-enyocha ihe nkiri. O nyela aka na <i id="mwMQ">Vibe</i>, <i id="mwMw">King</i>, <i id="mwNQ">Complex</i>, Rides, XXL, The Source, The Ring na ndị ọzọ. O dere ma mepụta ihe nkiri otu nzuzo Bad Biology, ma na-akwadokwa websaịtị "Film School" na MTV 's Film.com.