Asụsụ Sara nwèrè ìhè karịrị asụsụ irí ná abụọ nkè Bongo Bagirmi nkè á na-asụkarị ná Chad; á na-esokwa olé ná olé n'ebe ugwu nke Central African Republic. Há bụ ndị òtù asụsụ Central Sudanic. Greenberg (1966) na-emeso ụdị niile dị ka olumba nkè asụsụ Sara, ébé Tucker ná Bryan (1966) na'ewere Sara dị kà ụyọkọ olumba nkè ọtụtụ asụsụ. Ọtụtụ ndị òtù asụsụ / olumba Sara dị iche iche na-ewere ụdị ókwú há dị iche iche, mànà ugbu a, ozi asụsụ ezughi oké iji chọpụta ụdị okwu dị ichè ichè á ga-ewere dị kà asụsụ dị ichè íchè.
Ụdị kachasị ukwuu nkè Sara bụ Ngambay (Sara Ngambay), asụsụ azụmahịa nkè ndịda Chad, nkè nwèrè ìhè dị kà otú nde ndị na-asụ yá, ọ bụ ezie ná Sar (Sara Madjingay) bụ asụsụ nkè Sarh.